1Emesịa, Joshua kpọkọtara ndị agha si nʼebo Ruben, na Gad, na ọkara Manase, gwa ha okwu sị:
2“Unu emeela ihe niile Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu nʼiwu. Unu egeela ntị nʼolu m, mee ihe niile m nyere unu nʼiwu.
3E, unu arụzuola ọrụ ahụ Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu. Unu ahapụghị ụmụnna unu nʼọgbọ agha ogologo ụbọchị ndị a niile.