Joshua 22

Mgbe ha rutere Gelilọt dị nʼakụkụ Jọdan, nʼala ndị Kenan, ụmụ Ruben, ndị Gad na ọkara ebo Manase wuru ebe ịchụ aja dị ukwu nʼebe ahụ nʼakụkụ Jọdan.

Joshua 22:10 (UKJV) And when they came unto the borders of Jordan, that are in the land of Canaan, the children of Reuben and the children of Gad and the half tribe of Manasseh built there an altar by Jordan, a great altar to see to.

8“Werenụ ọtụtụ akụ unu lụtara nʼagha laa. Mgbe unu ruru, kenyenụ ndị ikwu unu ụfọdụ ihe site nʼime akụ ndị iro unu a.” Nʼihi na ihe ha kwatara nʼagha dị ukwuu: igwe anụ ụlọ, na ọlaọcha, na ọlaedo, na bronz, na igwe, na uwe dị iche iche.

9Ya mere, ndị agha Ruben na Gad, na ọkara ebo Manase, hapụrụ ndị agha Izrel na Shaịlo, nʼime ala Kenan, nʼofe osimiri Jọdan, laghachi nʼala nke ha dị na Gilead, nke ha nwetara dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.

10Mgbe ha rutere Gelilọt dị nʼakụkụ Jọdan, nʼala ndị Kenan, ụmụ Ruben, ndị Gad na ọkara ebo Manase wuru ebe ịchụ aja dị ukwu nʼebe ahụ nʼakụkụ Jọdan.

11Mgbe ndị Izrel nụrụ na ha e wuola ebe ịchụ aja nʼoke ala Kenan, na Gelilọt, nʼebe dị nso Jọdan, nʼofe ala ndị Izrel,

12ọgbakọ Izrel niile zukọtara na Shaịlo, jikere ịga ibuso ụmụnna ha ahụ agha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.