Joshua 22

“Werenụ ọtụtụ akụ unu lụtara nʼagha laa. Mgbe unu ruru, kenyenụ ndị ikwu unu ụfọdụ ihe site nʼime akụ ndị iro unu a.” Nʼihi na ihe ha kwatara nʼagha dị ukwuu: igwe anụ ụlọ, na ọlaọcha, na ọlaedo, na bronz, na igwe, na uwe dị iche iche.

Joshua 22:8 (UKJV) And he spoke unto them, saying, Return with much riches unto your tents, and with very much cattle, with silver, and with gold, and with brass, and with iron, and with very much raiment: divide the spoil of your enemies with your brethren.

6Ya mere, Joshua gọziri ha, zipụ ha, ha lakwara nʼụlọ nke aka ha.

7Ọkara ebo Manase ka Mosis nyere ihe nketa nke ha nʼime ala Bashan, ma ọkara ebo Manase nke ọzọ nwetara ihe nketa nke ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan. Mgbe Joshua na-ezilaga ha nʼụlọ ha, ọ gọziri ha, gwa ha okwu sị,

8“Werenụ ọtụtụ akụ unu lụtara nʼagha laa. Mgbe unu ruru, kenyenụ ndị ikwu unu ụfọdụ ihe site nʼime akụ ndị iro unu a.” Nʼihi na ihe ha kwatara nʼagha dị ukwuu: igwe anụ ụlọ, na ọlaọcha, na ọlaedo, na bronz, na igwe, na uwe dị iche iche.

9Ya mere, ndị agha Ruben na Gad, na ọkara ebo Manase, hapụrụ ndị agha Izrel na Shaịlo, nʼime ala Kenan, nʼofe osimiri Jọdan, laghachi nʼala nke ha dị na Gilead, nke ha nwetara dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.

10Mgbe ha rutere Gelilọt dị nʼakụkụ Jọdan, nʼala ndị Kenan, ụmụ Ruben, ndị Gad na ọkara ebo Manase wuru ebe ịchụ aja dị ukwu nʼebe ahụ nʼakụkụ Jọdan.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.