11Mgbe ndị Izrel nụrụ na ha e wuola ebe ịchụ aja nʼoke ala Kenan, na Gelilọt, nʼebe dị nso Jọdan, nʼofe ala ndị Izrel,
12ọgbakọ Izrel niile zukọtara na Shaịlo, jikere ịga ibuso ụmụnna ha ahụ agha.
13Ya mere, ụmụ Izrel zigara Finehaz, nwa Elieza, bụ onye nchụaja ka ọ ga nʼala Gilead, ya bụ ijekwuru ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase.
14Ndị so Finehaz nʼozi a bụ ndị ndu iri. Otu onyendu sitere nʼotu ebo, nʼime ebo iri nke ụmụ Izrel.
15Mgbe ndị a rutere nʼala Gilead, ha kpọkọtara ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase gwa ha okwu sị,