Joshua 22

Mgbe ndị a rutere nʼala Gilead, ha kpọkọtara ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase gwa ha okwu sị,

Joshua 22:15 (UKJV) And they came unto the children of Reuben, and to the children of Gad, and to the half tribe of Manasseh, unto the land of Gilead, and they spoke with them, saying,

13Ya mere, ụmụ Izrel zigara Finehaz, nwa Elieza, bụ onye nchụaja ka ọ ga nʼala Gilead, ya bụ ijekwuru ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase.

14Ndị so Finehaz nʼozi a bụ ndị ndu iri. Otu onyendu sitere nʼotu ebo, nʼime ebo iri nke ụmụ Izrel.

15Mgbe ndị a rutere nʼala Gilead, ha kpọkọtara ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase gwa ha okwu sị,

16“Otu a ka ọgbakọ niile nke Onyenwe anyị sịrị, ‘Olee ụdị njehie dị nke a, nke unu mere megide Chineke? Olee otu unu si wezuga onwe unu site nʼebe Onyenwe anyị nọ, gaa wuore onwe unu ebe ịchụ aja, si otu a nupu isi megide ya?

17Ọ pụtara na mmehie Peoa ezubereghị anyị? Ruo taa anyị asachapụbeghị onwe anyị site na mmehie ahụ, ọ bụ ezie nʼọrịa na-efe efe dakwasịrị nzukọ nke Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.