Joshua 22

“Otu a ka ọgbakọ niile nke Onyenwe anyị sịrị, ‘Olee ụdị njehie dị nke a, nke unu mere megide Chineke? Olee otu unu si wezuga onwe unu site nʼebe Onyenwe anyị nọ, gaa wuore onwe unu ebe ịchụ aja, si otu a nupu isi megide ya?

Joshua 22:16 (UKJV) Thus says the whole congregation of the LORD, What trespass is this that all of you have committed against the God of Israel, to turn away this day from following the LORD, in that all of you have built you an altar, that all of you might rebel this day against the LORD?

14Ndị so Finehaz nʼozi a bụ ndị ndu iri. Otu onyendu sitere nʼotu ebo, nʼime ebo iri nke ụmụ Izrel.

15Mgbe ndị a rutere nʼala Gilead, ha kpọkọtara ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase gwa ha okwu sị,

16“Otu a ka ọgbakọ niile nke Onyenwe anyị sịrị, ‘Olee ụdị njehie dị nke a, nke unu mere megide Chineke? Olee otu unu si wezuga onwe unu site nʼebe Onyenwe anyị nọ, gaa wuore onwe unu ebe ịchụ aja, si otu a nupu isi megide ya?

17Ọ pụtara na mmehie Peoa ezubereghị anyị? Ruo taa anyị asachapụbeghị onwe anyị site na mmehie ahụ, ọ bụ ezie nʼọrịa na-efe efe dakwasịrị nzukọ nke Onyenwe anyị.

18Ugbu a, unu na-achọkwa isite nʼebe Onyenwe anyị nọ chigharịa. “ ‘Ọ bụrụ na unu enupu isi megide Onyenwe anyị taa, matakwanụ na echi ya, ọ ga-eweso nzukọ Izrel niile iwe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.