Joshua 22

Ugbu a, unu na-achọkwa isite nʼebe Onyenwe anyị nọ chigharịa. “ ‘Ọ bụrụ na unu enupu isi megide Onyenwe anyị taa, matakwanụ na echi ya, ọ ga-eweso nzukọ Izrel niile iwe.

Joshua 22:18 (UKJV) But that all of you must turn away this day from following the LORD? and it will be, seeing all of you rebel to day against the LORD, that tomorrow he will be angry with the whole congregation of Israel.

16“Otu a ka ọgbakọ niile nke Onyenwe anyị sịrị, ‘Olee ụdị njehie dị nke a, nke unu mere megide Chineke? Olee otu unu si wezuga onwe unu site nʼebe Onyenwe anyị nọ, gaa wuore onwe unu ebe ịchụ aja, si otu a nupu isi megide ya?

17Ọ pụtara na mmehie Peoa ezubereghị anyị? Ruo taa anyị asachapụbeghị onwe anyị site na mmehie ahụ, ọ bụ ezie nʼọrịa na-efe efe dakwasịrị nzukọ nke Onyenwe anyị.

18Ugbu a, unu na-achọkwa isite nʼebe Onyenwe anyị nọ chigharịa. “ ‘Ọ bụrụ na unu enupu isi megide Onyenwe anyị taa, matakwanụ na echi ya, ọ ga-eweso nzukọ Izrel niile iwe.

19Ọ bụrụ na unu wuru ebe ịchụ aja ahụ nʼihi na ala unu rụrụ arụ, bịakwutenụ anyị nʼakụkụ nke ọzọ, nke osimiri a, ebe Onyenwe anyị bi nʼetiti anyị, nʼime ụlọ nzute obibi ya. Anyị ga-ekenyekwa unu ala anyị. Ma unu enupula isi megide Onyenwe anyị site nʼiwu ebe ịchụ aja ọzọ, ebe ọ bụ na e nwere otu ebe bụ ezi ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị Chineke anyị.

20Mgbe Ekan, nwa Zera, zipụtara onwe ya dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼihe metụtara ihe e doro nsọ, ọ bụ na nzukọ Izrel niile esoghị keta oke nʼahụhụ dakwasịrị ya? Ọ bụghị naanị ya nwụrụ nʼihi mmehie ahụ.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.