Joshua 22

Ọ bụrụ na anyị sitere na nnupu isi wuo ebe ịchụ aja a maka ịchụ aja udo maọbụ aja mkpụrụ ọka, ka Onyenwe anyị nʼonwe ya taa anyị ahụhụ.

Joshua 22:23 (UKJV) That we have built us an altar to turn from following the LORD, or if to offer thereon burnt offering or food offering, or if to offer peace offerings thereon, let the LORD himself require it;

21Nke a bụ nzaghachi ụmụ Ruben, na ụmụ Gad na ọkara ebo ụmụ Manase, nyere ndị ndu ụmụ Izrel niile;

22“Chineke onye kachasị chi niile, bụ Onyenwe anyị! Chineke onye kachasị chi niile, bụ Onyenwe anyị! Ya onwe ya maara, ka Izrel niile matakwa. A sị na nke a bụ nnupu isi, a sịkwarị na ọ bụ enweghị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, unu ahapụla anyị ka anyị dịrị ndụ.

23Ọ bụrụ na anyị sitere na nnupu isi wuo ebe ịchụ aja a maka ịchụ aja udo maọbụ aja mkpụrụ ọka, ka Onyenwe anyị nʼonwe ya taa anyị ahụhụ.

24“Ma nke ahụ abụghị ihe anyị bu nʼobi! Anyị wuru ya nʼihi na anyị tụrụ ụjọ na nʼoge dị nʼihu, ụmụ unu ga-agwa ụmụ anyị okwu sị, ‘Gịnị ka unu na Onyenwe anyị, Chineke Izrel nwekọrọ?

25Onyenwe anyị e jirila osimiri Jọdan kpaa oke nʼetiti anyị na unu, unu ụmụ Ruben na Gad. Unu enweghị oke nʼime Onyenwe anyị!’ Nʼụzọ dị otu a, ụmụ unu nwere ike ime ụmụ anyị ka ha kwụsị ịtụ egwu Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.