1Ma mgbe ọtụtụ oge gasịrị, site nʼoge Onyenwe anyị mere ka Izrel nwee ezumike nʼebe ndị iro gbara ha okirikiri nọ, Joshua aghọọla agadi, gbaa ọtụtụ afọ.
2Ya mere, Joshua kpọrọ ndị Izrel niile, ndị okenye ha, ndị ndu ha, ndị odozi okwu ha na ndịisi ha, sị ha, “Emeela m agadi gbaakwa ọtụtụ afọ.
3Unu onwe unu ejirila anya unu hụ ihe niile Onyenwe anyị Chineke unu mere mba ndị a niile, nʼihi unu. Ọ lụụrụ unu ọgụ, nyere unu aka imeri ndị iro unu.