32Mgbe ahụ Finehaz, nwa Elieza, onye nchụaja, na ndị ndu ahụ laghachitere Kenan site na nzukọ ha na ụmụ Ruben na Gad na ọkara Manase mere nʼala Gilead kọọrọ Izrel ihe ha gatara.
33Okwu a tọrọ ụmụ Izrel ụtọ. Ha ṅụrịrị ọṅụ, too Chineke otuto. Ha ekwukwaghị okwu ibu agha megide ụmụ Ruben, ụmụ Gad na ụmụ Manase, banyere ibibi ala ha bi nʼime ya.
34Ya mere, ụmụ Ruben na ụmụ Gad kpọrọ ebe ịchụ aja ha wuru, “Ebe ịchụ aja akaebe,” nʼihi na ha sịrị, “Ọ bụ ihe akaebe igosi mmadụ niile na Onyenwe anyị bụkwa Chineke anyị.”