Joshua 22

Okwu a tọrọ ụmụ Izrel ụtọ. Ha ṅụrịrị ọṅụ, too Chineke otuto. Ha ekwukwaghị okwu ibu agha megide ụmụ Ruben, ụmụ Gad na ụmụ Manase, banyere ibibi ala ha bi nʼime ya.

Joshua 22:33 (UKJV) And the thing pleased the children of Israel; and the children of Israel blessed God, and did not intend to go up against them in battle, to destroy the land wherein the children of Reuben and Gad dwelt.

31Ya mere, Finehaz nwa Elieza, bụ onye nchụaja, sịrị Ruben, na Gad, na Manase, “Taa ka anyị maara na Onyenwe anyị nọ nʼetiti anyị, nʼihi na unu emehieghị megide Onyenwe anyị dịka anyị chere. Ya mere, unu azọpụtala ndị Izrel site na mbibi gaara abịakwasị ha site nʼaka Onyenwe anyị.”

32Mgbe ahụ Finehaz, nwa Elieza, onye nchụaja, na ndị ndu ahụ laghachitere Kenan site na nzukọ ha na ụmụ Ruben na Gad na ọkara Manase mere nʼala Gilead kọọrọ Izrel ihe ha gatara.

33Okwu a tọrọ ụmụ Izrel ụtọ. Ha ṅụrịrị ọṅụ, too Chineke otuto. Ha ekwukwaghị okwu ibu agha megide ụmụ Ruben, ụmụ Gad na ụmụ Manase, banyere ibibi ala ha bi nʼime ya.

34Ya mere, ụmụ Ruben na ụmụ Gad kpọrọ ebe ịchụ aja ha wuru, “Ebe ịchụ aja akaebe,” nʼihi na ha sịrị, “Ọ bụ ihe akaebe igosi mmadụ niile na Onyenwe anyị bụkwa Chineke anyị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.