Joshua 22

Ya mere, Finehaz nwa Elieza, bụ onye nchụaja, sịrị Ruben, na Gad, na Manase, “Taa ka anyị maara na Onyenwe anyị nọ nʼetiti anyị, nʼihi na unu emehieghị megide Onyenwe anyị dịka anyị chere. Ya mere, unu azọpụtala ndị Izrel site na mbibi gaara abịakwasị ha site nʼaka Onyenwe anyị.”

Joshua 22:31 (UKJV) And Phinehas the son of Eleazar the priest said unto the children of Reuben, and to the children of Gad, and to the children of Manasseh, This day we perceive that the LORD is among us, because all of you have not committed this trespass against the LORD: now all of you have delivered the children of Israel out of the hand of the LORD.

29“Anyị agaghị enupu isi nʼebe Onyenwe anyị nọ; anyị agaghị esitekwa nʼiso Onyenwe anyị Chineke wezuga onwe anyị, site nʼiwuru onwe anyị ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka maọbụ ụdị aja ọzọ dị iche iche. Ebe ịchụ aja anyị maara bụ ebe ịchụ aja Onyenwe anyị Chineke anyị, nke guzo nʼihu ụlọ nzute ya.”

30Mgbe Finehaz onye nchụaja, na ndị ndu nzukọ ahụ, bụ ndịisi ezinaụlọ ndị Izrel nụrụ ihe ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ụmụ Manase kwuru, ọ masịrị ha.

31Ya mere, Finehaz nwa Elieza, bụ onye nchụaja, sịrị Ruben, na Gad, na Manase, “Taa ka anyị maara na Onyenwe anyị nọ nʼetiti anyị, nʼihi na unu emehieghị megide Onyenwe anyị dịka anyị chere. Ya mere, unu azọpụtala ndị Izrel site na mbibi gaara abịakwasị ha site nʼaka Onyenwe anyị.”

32Mgbe ahụ Finehaz, nwa Elieza, onye nchụaja, na ndị ndu ahụ laghachitere Kenan site na nzukọ ha na ụmụ Ruben na Gad na ọkara Manase mere nʼala Gilead kọọrọ Izrel ihe ha gatara.

33Okwu a tọrọ ụmụ Izrel ụtọ. Ha ṅụrịrị ọṅụ, too Chineke otuto. Ha ekwukwaghị okwu ibu agha megide ụmụ Ruben, ụmụ Gad na ụmụ Manase, banyere ibibi ala ha bi nʼime ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.