8“ ‘Ma emesịa, emere m ka unu bata nʼime ala ndị Amọrait, ndị bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Ha lụsoro unu ọgụ, ma eweere m ha nyefee unu nʼaka. E bibiri m ha nʼihu unu, ma unu nwetara ala ha.
9Mgbe Balak nwa Zipoa, eze Moab, jikeere ibuso Izrel agha, o zigaara Belam, nwa Beoa ozi ka ọ bịa bụọ unu ọnụ.
10Ma egeghị m Belam ntị. Kama emere m ya ka ọ gọzie unu. Anapụtara m unu site nʼaka ya.
11“ ‘Emesịa, unu gafere osimiri Jọdan bịaruo Jeriko. Ndị ikom Jeriko busoro unu agha, otu a kwa ka ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Gigash, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Ma eweere m ha niile nyefee unu nʼaka.
12E zigara m ebu nʼihu unu nke chụpụrụ ha nʼihu unu, bụ eze abụọ ndị Amọrait. Ọ bụghị mma agha na ụta unu ka unu ji mee nke a.