Joshua 24

E zigara m ebu nʼihu unu nke chụpụrụ ha nʼihu unu, bụ eze abụọ ndị Amọrait. Ọ bụghị mma agha na ụta unu ka unu ji mee nke a.

Joshua 24:12 (UKJV) And I sent the hornet before you, which drove them out from before you, even the two kings of the Amorites; but not with your sword, nor with your bow.

10Ma egeghị m Belam ntị. Kama emere m ya ka ọ gọzie unu. Anapụtara m unu site nʼaka ya.

11“ ‘Emesịa, unu gafere osimiri Jọdan bịaruo Jeriko. Ndị ikom Jeriko busoro unu agha, otu a kwa ka ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Gigash, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Ma eweere m ha niile nyefee unu nʼaka.

12E zigara m ebu nʼihu unu nke chụpụrụ ha nʼihu unu, bụ eze abụọ ndị Amọrait. Ọ bụghị mma agha na ụta unu ka unu ji mee nke a.

13Ya mere enyere m unu ala ahụ, nke unu na-adọgbughị onwe unu nʼihi ya, nyekwa unu ọtụtụ obodo nke unu na-ewughị, bụ ala ndị a unu bi nʼime ya ugbu a. Enyere m unu ubi vaịnị na ubi oliv nke unu na-akụghị, nke unu na-eri mkpụrụ ha.’

14“Ya mere ugbu a, tụọnụ egwu Onyenwe anyị, feekwanụ ya ofufe nʼụzọ ikwesi ntụkwasị obi na nʼeziokwu. Wezuganụ chi ndị ahụ niile nna nna unu ha fere ofufe nʼofe osimiri Yufretis ahụ, na nʼIjipt. Feenụ naanị Onyenwe anyị ofufe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.