Joshua 24

“Ya mere ugbu a, tụọnụ egwu Onyenwe anyị, feekwanụ ya ofufe nʼụzọ ikwesi ntụkwasị obi na nʼeziokwu. Wezuganụ chi ndị ahụ niile nna nna unu ha fere ofufe nʼofe osimiri Yufretis ahụ, na nʼIjipt. Feenụ naanị Onyenwe anyị ofufe.

Joshua 24:14 (UKJV) Now therefore fear the LORD, and serve him in sincerity and in truth: and put away the gods which your fathers served on the other side of the flood, and in Egypt; and serve all of you the LORD.

12E zigara m ebu nʼihu unu nke chụpụrụ ha nʼihu unu, bụ eze abụọ ndị Amọrait. Ọ bụghị mma agha na ụta unu ka unu ji mee nke a.

13Ya mere enyere m unu ala ahụ, nke unu na-adọgbughị onwe unu nʼihi ya, nyekwa unu ọtụtụ obodo nke unu na-ewughị, bụ ala ndị a unu bi nʼime ya ugbu a. Enyere m unu ubi vaịnị na ubi oliv nke unu na-akụghị, nke unu na-eri mkpụrụ ha.’

14“Ya mere ugbu a, tụọnụ egwu Onyenwe anyị, feekwanụ ya ofufe nʼụzọ ikwesi ntụkwasị obi na nʼeziokwu. Wezuganụ chi ndị ahụ niile nna nna unu ha fere ofufe nʼofe osimiri Yufretis ahụ, na nʼIjipt. Feenụ naanị Onyenwe anyị ofufe.

15Ọ bụrụkwanụ na ọ masịghị unu ife Onyenwe anyị, họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe. Ma ọ bụ chi ndị ahụ nna nna unu ha fere nʼofe ọzọ nke osimiri, maọbụ chi ndị Amọrait, ndị unu bi nʼala ha. Ma nʼebe mụ onwe m na ezinaụlọ m nọ, anyị ga-efe Onyenwe anyị.”

16Ndị Izrel niile zara sị ya, “O nweghị ihe ga-eme ka anyị hapụ Onyenwe anyị fee chi ndị ọzọ!

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.