5“ ‘Emesịa, ezigara m Mosis na Erọn, ma wetara ndị Ijipt ihe otiti ọjọọ niile dị iche iche site nʼihe m mere nʼebe ahụ. Nʼikpeazụ, akpọpụtara m ndị m site nʼala Ijipt.
6Ma mgbe unu rutere nʼOsimiri Uhie, ndị agha Ijipt gbapụtara chịrị ụgbọ agha ha na ndị agha na-agba ịnyịnya ha chụwa unu ọsọ.
7Mgbe ndị Izrel hụrụ ha, ha tiri mkpu kpọkuo Onyenwe anyị. O tinyere oke ọchịchịrị nʼetiti unu na ndị Ijipt. O mere ka oke osimiri kpuchie ha, mee ka ha mikpuo nʼosimiri ahụ. Unu niile hụkwara ihe m mere ndị Ijipt. Emesịa, unu bikwara nʼọzara ọtụtụ afọ.
8“ ‘Ma emesịa, emere m ka unu bata nʼime ala ndị Amọrait, ndị bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Ha lụsoro unu ọgụ, ma eweere m ha nyefee unu nʼaka. E bibiri m ha nʼihu unu, ma unu nwetara ala ha.
9Mgbe Balak nwa Zipoa, eze Moab, jikeere ibuso Izrel agha, o zigaara Belam, nwa Beoa ozi ka ọ bịa bụọ unu ọnụ.