1Nʼisi ụtụtụ, Joshua na ụmụ Izrel niile hapụrụ Shitim bịaruo nʼakụkụ osimiri Jọdan, maa ụlọ ikwu nʼebe ahụ. Nʼebe a ka ha nọ chere tutu ruo mgbe ha ga-agafe.
2Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ndịisi ụmụ Izrel gabigara jegharịa nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ahụ,
3nye ha iwu sị, “Mgbe unu hụrụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, ka ndị nchụaja, ụmụ Livayị, bulitere ya, unu onwe unu ga-esi nʼebe unu nọ bilie soro ha nʼazụ.