Joshua 3

Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ndịisi ụmụ Izrel gabigara jegharịa nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ahụ,

Joshua 3:2 (UKJV) And it came to pass after three days, that the officers went through the host;

1Nʼisi ụtụtụ, Joshua na ụmụ Izrel niile hapụrụ Shitim bịaruo nʼakụkụ osimiri Jọdan, maa ụlọ ikwu nʼebe ahụ. Nʼebe a ka ha nọ chere tutu ruo mgbe ha ga-agafe.

2Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ndịisi ụmụ Izrel gabigara jegharịa nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ahụ,

3nye ha iwu sị, “Mgbe unu hụrụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, ka ndị nchụaja, ụmụ Livayị, bulitere ya, unu onwe unu ga-esi nʼebe unu nọ bilie soro ha nʼazụ.

4Ma a ga-enwe oke nʼetiti unu na ha, ihe dịka otu kilomita site nʼebe igbe ọgbụgba ndụ ahụ dị. Unu agaghị abịaru ya nso. Nke a bụ maka ị mara ụzọ unu ga-eso, nʼihi na unu esibeghị nʼụzọ a gaa ije mbụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.