Joshua 3

Otu a ka unu ga-esi mata nʼezie na Chineke dị ndụ nọ nʼetiti unu, unu ga-amatakwa na ọ ghaghị ịnapụ ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Hiv, na ndị Periz, na ndị Gigash, na ndị Amọrait, na ndị Jebus ala ha nʼihu unu.

Joshua 3:10 (UKJV) And Joshua said, Hereby all of you shall know that the living God is among you, and that he will without fail drive out from before you the Canaanites, and the Hittites, and the Hivites, and the Perizzites, and the Girgashites, and the Amorites, and the Jebusites.

8Ị ga-enye ndị nchụaja bụ ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ iwu si, ‘Mgbe unu ruru nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan, banyekwanụ gaa guzo nʼime osimiri ahụ.’ ”

9Mgbe ahụ, Joshua gwara ụmụ Izrel niile sị, “Bịanụ nso, bịanụ nụrụ okwu niile nke Onyenwe anyị Chineke unu.

10Otu a ka unu ga-esi mata nʼezie na Chineke dị ndụ nọ nʼetiti unu, unu ga-amatakwa na ọ ghaghị ịnapụ ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Hiv, na ndị Periz, na ndị Gigash, na ndị Amọrait, na ndị Jebus ala ha nʼihu unu.

11Lee, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onyenwe ụwa niile ga-agabiga nʼihu unu banye nʼime Jọdan.

12Ugbu a sitenụ nʼebo Izrel niile họpụta ndị ikom iri na abụọ, site nʼebo ọbụla otu onye.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.