Joshua 3

Ngwangwa ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onyenwe ụwa niile zọnyere ụkwụ na Jọdan, mmiri Jọdan nke si nʼebe elu ya na-arịdata ga-akwụsị ịsọ, guzoro dịka mgbidi.”

Joshua 3:13 (UKJV) And it shall come to pass, as soon as the soles of the feet of the priests that bear the ark of the LORD, the LORD of all the earth, shall rest in the waters of Jordan, that the waters of Jordan shall be cut off from the waters that come down from above; and they shall stand upon an heap.

11Lee, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onyenwe ụwa niile ga-agabiga nʼihu unu banye nʼime Jọdan.

12Ugbu a sitenụ nʼebo Izrel niile họpụta ndị ikom iri na abụọ, site nʼebo ọbụla otu onye.

13Ngwangwa ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onyenwe ụwa niile zọnyere ụkwụ na Jọdan, mmiri Jọdan nke si nʼebe elu ya na-arịdata ga-akwụsị ịsọ, guzoro dịka mgbidi.”

14Ya mere, mgbe ndị Izrel sitere nʼụlọ ikwu ha bilie njem ịgabiga osimiri Jọdan, ndị nchụaja bụ igbe ọgbụgba ndụ buuru ha ụzọ na-aga ha nʼihu.

15Nʼoge owuwe ihe ubi ọbụla, osimiri Jọdan na-etoju etoju, sọjukwaa akụkụ ya niile. Ma ngwangwa ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ a bịaruru nso zọnye ụkwụ ha nʼọnụ mmiri Jọdan,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.