Joshua 3

Ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị guzoro nʼala akọrọ nʼetiti Jọdan, Izrel niile gabigakwara tutu ruo mgbe mba ahụ niile gafesịrị nʼala akọrọ.

Joshua 3:17 (UKJV) And the priests that bare the ark of the covenant of the LORD stood firm on dry ground in the midst of Jordan, and all the Israelites passed over on dry ground, until all the people were passed clean over Jordan.

15Nʼoge owuwe ihe ubi ọbụla, osimiri Jọdan na-etoju etoju, sọjukwaa akụkụ ya niile. Ma ngwangwa ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ a bịaruru nso zọnye ụkwụ ha nʼọnụ mmiri Jọdan,

16mmiri si nʼelu elu osimiri ahụ kwụsịrị ịsọ, ọ gara elu tụkọta onwe ya dịka mgbidi nʼebe dị anya, nʼobodo a na-akpọ Adam, nke dị nso obodo Zaretan. Ebe mmiri nke na-eruda na-asọbanye osimiri Araba, ya bụ, osimiri Nnu kwụsịrị ịsọ kpamkpam. Ya mere, ndị Izrel gabigara na ncherita ihu Jeriko.

17Ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị guzoro nʼala akọrọ nʼetiti Jọdan, Izrel niile gabigakwara tutu ruo mgbe mba ahụ niile gafesịrị nʼala akọrọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.