Joshua 4

Ndị agha ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase, buuru ụmụ Izrel niile ụzọ gafee, idu ha nʼagha, dịka Mosis nyere ha nʼiwu.

Joshua 4:12 (UKJV) And the children of Reuben, and the children of Gad, and half the tribe of Manasseh, passed over armed before the children of Israel, as Moses spoke unto them:

10Ndị nchụaja, ndị bụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, guzoro nʼetiti osimiri Jọdan, tutu ruo mgbe e mezuru iwu ahụ niile Onyenwe anyị nyere Joshua site nʼọnụ Mosis. Mgbe ahụ kwa, ndị Izrel mere ngwangwa gafee osimiri Jọdan.

11Ngwangwa ha niile gafetasịrị, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na ndị nchụaja gafetakwara nʼakụkụ nke ọzọ, ka ndị mmadụ na-ele ha anya.

12Ndị agha ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase, buuru ụmụ Izrel niile ụzọ gafee, idu ha nʼagha, dịka Mosis nyere ha nʼiwu.

13Ndị agha ọnụọgụgụ ha ruru iri puku anọ (40,000), ndị jikeere nke ọma ibu agha, duuru ebo ndị ọzọ, gafere nʼihu Onyenwe anyị bata nʼobosara ala Jeriko maka ibu agha.

14Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị Onyenwe anyị buliri Joshua elu nke ukwuu nʼihi na o mere Joshua ka ọ dị ukwuu nʼanya ndị Izrel niile, si otu a mee ka ha tụọ ya egwu nke ukwuu dịka ha si tụọ Mosis egwu, ma sọpụkwara ya ụbọchị niile nke ndụ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.