Joshua 4

“Nye ndị nchụaja, ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ iwu ka ha si nʼosimiri Jọdan pụta.”

Joshua 4:16 (UKJV) Command the priests that bear the ark of the testimony, that they come up out of Jordan.

14Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị Onyenwe anyị buliri Joshua elu nke ukwuu nʼihi na o mere Joshua ka ọ dị ukwuu nʼanya ndị Izrel niile, si otu a mee ka ha tụọ ya egwu nke ukwuu dịka ha si tụọ Mosis egwu, ma sọpụkwara ya ụbọchị niile nke ndụ ya.

15Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị,

16“Nye ndị nchụaja, ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ iwu ka ha si nʼosimiri Jọdan pụta.”

17Ya mere Joshua nyere ndị nchụaja iwu sị ha, “Sitenụ nʼosimiri Jọdan pụta.”

18Mgbe ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ si nʼosimiri Jọdan rịpụta, dịka ọbụ ụkwụ ha na-emetụ nʼala akọrọ, mmiri osimiri ahụ sọghachiri nʼọnọdụ ya ruchie akụkụ ya niile, ka ọ dị na mbụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.