Joshua 4

Gwa ha, ‘Izrel gafere osimiri Jọdan nʼala akọrọ.’

Joshua 4:22 (UKJV) Then all of you shall let your children know, saying, Israel came over this Jordan on dry land.

20Nkume iri na abụọ ahụ ha si nʼosimiri Jọdan buputa, ka Joshua guzobere na Gilgal.

21Ọ sịrị ndị Izrel, “Nʼoge dị nʼihu, mgbe ụmụ unu ga-ajụ ndị bụ nna ha ajụjụ sị, ‘Gịnị ka nkume ndị a pụtara, Gịnịkwa ka ha na-egosi?’

22Gwa ha, ‘Izrel gafere osimiri Jọdan nʼala akọrọ.’

23Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu mere ka osimiri Jọdan takpọọ nʼihu unu tutu ruo mgbe unu gafesịrị nʼofe nke ọzọ. Onyenwe anyị Chineke unu mere osimiri Jọdan ihe o mere osimiri Uhie mgbe o mere ka osimiri Uhie takpọọ nʼihu anyị, tutu ruo mgbe anyị gafesịrị nʼofe ya nke ọzọ.

24O mere ihe ndị a niile ka ndị niile bi nʼelu ụwa mata na aka Onyenwe anyị dị ike. O mekwara ya ka unu onwe unu tụọ egwu Onyenwe anyị Chineke unu, mgbe niile.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.