11Nʼụbọchị sotere ụbọchị ngabiga, nʼotu ụbọchị ahụ, ha riri ụfọdụ ihe ubi nke ala Kenan. Ọ bụ achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, na ọka ahụrụ nʼọkụ ka ha tara.
12Mánà kwụsịkwara nʼechi ya mgbe ha riri nri sitere nʼala ahụ. Ụmụ Izrel ahụkwaghị mánà anya ọzọ, ma nʼafọ ahụ ha riri ihe omume ubi si nʼala Kenan.
13Mgbe Joshua nọ nso obodo Jeriko, o weliri anya ya elu hụ otu nwoke ka o guzo nʼihu ya. Nwoke a mịpụtara mma agha ya jide ya nʼaka ya. Joshua jekwuru ya jụọ ya sị ya, “Ị dịnyeere anyị ka ị dịnyeere ndị iro anyị?”
14Nwoke ahụ zaghachiri ya sị, “Ọ dịghị onye m dịnyeere, kama abịara m ugbu a dịka ọchịagha usuu ndị agha Onyenwe anyị.” Joshua dara nʼala kpuo ihu ya nʼala kpọọ isiala nye ya, sị ya, “Ejikerela m ime ihe ọbụla i nyere nʼiwu. Onyenwe m, gịnị ka ị chọrọ ka m mee?”
15Ọchịagha usuu ndị agha Onyenwe anyị zara sị Joshua, “Yipụ akpụkpọụkwụ gị, nʼihi na ebe ahụ i guzo bụ ala dị nsọ.” Joshua mere dịka ọ gwara ya.