5Mgbe ụmụ Izrel niile si Ijipt pụta, e biri ndị nwoke niile nọ nʼetiti ha ugwu. Ma nʼime iri afọ anọ ahụ ha na-awagharị nʼọzara, o nweghị ụmụ ha ndị nwoke a mụrụ nʼoge a e biri ugwu.
6Ndị Izrel niile awagharịala nʼọzara iri afọ anọ tutu ruo mgbe ndị ikom niile toruru ije agha, bụ ndị hapụrụ Ijipt nwụchara, ebe ọ bụ na ha jụrụ irubere Onyenwe anyị isi. Nʼihi na Onyenwe anyị ṅụrụ iyi sị ha na ha agaghị ahụ ala ahụ anya, bụ ala ahụ o kwere nna nna ha na nkwa, inye anyị, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.
7Onyenwe anyị mere ka ụmụ ndị nnupu isi a mụtara nọchie anya ha. Ọ bụkwa ndị a ka Joshua biri ugwu, nʼihi na tutu ruo ugbu a, e bibeghị ha ugwu.
8Mgbe e bizuru mba niile ahụ ugwu, ha nọdụrụ nʼebe ahụ ha mara ụlọ ikwu tutu ọnya obibi ugwu ha alaa.
9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị, “Taa, ewezugala m site nʼebe unu nọ ihe nkọcha nke ya na Ijipt so.” Nʼihi nke a, ha kpọrọ ebe ahụ Gilgal. Ọ bụkwa aha ya ruo taa.