14Nʼụbọchị nke abụọ, ha gbara obodo ahụ gburugburu otu ugboro, laghachikwa nʼụlọ ikwu ha. Otu a ka ha mere ruo nʼụbọchị nke isii.
15Ma nʼisi ụtụtụ ụbọchị nke asaa, ha bilitere mgbe chi na-abọbeghị, gbaa obodo ahụ gburugburu ugboro asaa dịka ha na-eme. Ma ọ dị iche nʼụbọchị ahụ, bụ naanị na ha gbara obodo ahụ gburugburu ugboro asaa.
16O ruo, nʼoge njegharị nke ugboro asaa ahụ, mgbe ndị nchụaja asaa ndị a fụsiri opi ike asaa ndị ahụ ike karịa, ka Joshua gwara ndị Izrel sị ha, “Tienụ mkpu! Nʼihi na Onyenwe anyị enyela unu obodo a!
17Gbuonụ ihe niile na-eku ume ndụ, nʼihi na obodo a na ihe niile dị nʼime ha bụ ihe e doro nsọ nye Onyenwe anyị. Ma ọ bụ naanị Rehab, nwanyị akwụna ahụ ka unu ga-ahapụ ndụ, ya na ndị ọbụla nọ nʼụlọ ya. Nʼihi na o zoro ndị anyị zigara inyochapụta obodo ahụ.
18Ma unu onwe unu, wezuganụ onwe unu pụọ nʼebe ihe ndị a kwadoro mbibi dị, ka unu gharakwa iweta ịla nʼiyi nye onwe unu site na iwere ihe ọbụla nʼime ha. Ma ọ bụghị otu a, unu ga-eme ka mbibi dakwasị ụlọ ikwu ụmụ Izrel niile.