12Joshua biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị nchụaja bulikwara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.
13Ndị nchụaja asaa ahụ bu opi ike asaa ndị ahụ, na-aga nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na-afụ opi ike ha na-esepụghị aka. Ndị agha nọ nʼihu ha, ebe ndị nche na-eso ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị nʼazụ, nʼoge niile a a na-afụ opi ike ndị a na-esepụghị aka.
14Nʼụbọchị nke abụọ, ha gbara obodo ahụ gburugburu otu ugboro, laghachikwa nʼụlọ ikwu ha. Otu a ka ha mere ruo nʼụbọchị nke isii.
15Ma nʼisi ụtụtụ ụbọchị nke asaa, ha bilitere mgbe chi na-abọbeghị, gbaa obodo ahụ gburugburu ugboro asaa dịka ha na-eme. Ma ọ dị iche nʼụbọchị ahụ, bụ naanị na ha gbara obodo ahụ gburugburu ugboro asaa.
16O ruo, nʼoge njegharị nke ugboro asaa ahụ, mgbe ndị nchụaja asaa ndị a fụsiri opi ike asaa ndị ahụ ike karịa, ka Joshua gwara ndị Izrel sị ha, “Tienụ mkpu! Nʼihi na Onyenwe anyị enyela unu obodo a!