Joshua 6

Joshua biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị nchụaja bulikwara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.

Joshua 6:12 (UKJV) And Joshua rose early in the morning, and the priests took up the ark of the LORD.

10Ma Joshua nyere ndị Izrel iwu sị ha, “Unu emela mkpọtụ agha ọbụla, maọbụ kwee ka anụ olu unu, maọbụ kwuo okwu ọbụla, tutu ruo ụbọchị m ga-asị unu tie mkpu. Mgbe m nyere unu iwu a, tienụ ezi mkpu.”

11Ya mere, e buuru igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ jegharịa obodo ahụ gburugburu otu ugboro nʼụbọchị ahụ. Mgbe ha mesịrị nke a, onye ọbụla laghachiri nʼebe ụlọ ikwu ya dị rahụ ụra abalị.

12Joshua biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị nchụaja bulikwara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.

13Ndị nchụaja asaa ahụ bu opi ike asaa ndị ahụ, na-aga nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na-afụ opi ike ha na-esepụghị aka. Ndị agha nọ nʼihu ha, ebe ndị nche na-eso ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị nʼazụ, nʼoge niile a a na-afụ opi ike ndị a na-esepụghị aka.

14Nʼụbọchị nke abụọ, ha gbara obodo ahụ gburugburu otu ugboro, laghachikwa nʼụlọ ikwu ha. Otu a ka ha mere ruo nʼụbọchị nke isii.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.