Joshua 6

Mgbe ụda opi ike ahụ dasiri ike, ndị agha tiri mkpu, na ụda opi ike ahụ. Mgbe ndị ikom tiri oke mkpu, mgbidi ahụ dara dapịasịa, nke mere na onye ọbụla chere ihu banye nʼime obodo ahụ, lụgbuo obodo ahụ.

Joshua 6:20 (UKJV) So the people shouted when the priests blew with the trumpets: and it came to pass, when the people heard the sound of the trumpet, and the people shouted with a great shout, that the wall fell down flat, so that the people went up into the city, every man straight before him, and they took the city.

18Ma unu onwe unu, wezuganụ onwe unu pụọ nʼebe ihe ndị a kwadoro mbibi dị, ka unu gharakwa iweta ịla nʼiyi nye onwe unu site na iwere ihe ọbụla nʼime ha. Ma ọ bụghị otu a, unu ga-eme ka mbibi dakwasị ụlọ ikwu ụmụ Izrel niile.

19Ma ihe niile e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ, na ihe niile e ji bronz na igwe kpụọ, ka a ga-edo iche nye Onyenwe anyị. A ga-ewebata ha nʼụlọakụ Onyenwe anyị.”

20Mgbe ụda opi ike ahụ dasiri ike, ndị agha tiri mkpu, na ụda opi ike ahụ. Mgbe ndị ikom tiri oke mkpu, mgbidi ahụ dara dapịasịa, nke mere na onye ọbụla chere ihu banye nʼime obodo ahụ, lụgbuo obodo ahụ.

21Ha debere obodo a iche nye Onyenwe anyị site nʼiji mma agha ha gbuchapụ ihe niile dị ndụ nʼobodo ahụ, ma nwoke, ma nwanyị, ma nwantakịrị, ma okenye, ma ehi, ma atụrụ, ma ịnyịnya ibu, ihe niile dị nʼime ya.

22Mgbe ahụ, Joshua gwara ndị ikom abụọ ahụ buru ụzọ gaa nnyochapụta obodo ahụ anya sị ha, “Mezuonụ nkwa unu kwere. Gaanụ nʼụlọ nwanyị akwụna, kpọpụta ya na ndị niile dị nʼụlọ ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.