24Ha kpọrọ obodo ahụ ọkụ, ya na ihe niile dị nʼime ya. Ma ha wepụtara naanị ọlaọcha na ọlaedo, na ihe niile e ji bronz na igwe kpụọ, tinye nʼụlọakụ Onyenwe anyị.
25Joshua mere ka Rehab, nwanyị akwụna ahụ, na ndị ezinaụlọ ya niile dịrị ndụ. Nʼihi na Rehab zoro ndị ikom abụọ Joshua zigara, mee ka ha dị ndụ, bụ ndị gara inyochapụta obodo Jeriko. Ya mere, o binyere ndị Izrel ruo taa.
26Mgbe ahụ, Joshua gbara obodo Jeriko iyi sị, “Ọbụbụ ọnụ ka a na-abụ nwoke ọbụla nʼihu Onyenwe anyị nke ga-ebili wuokwa obodo Jeriko ọzọ. “Ndụ ọkpara ya ka ọ ga-eji tọọ ntọala ya niile, ndụ nwa ya nke nta, ka ọ ga-eji guzobe ọnụ ụzọ ama ya niile ọtọ.”
27Ya mere, Onyenwe anyị nọnyeere Joshua. Akụkọ a kọrọ banyere ya gbasara nke ukwuu nʼala ahụ niile.