Joshua 6

Joshua mere ka Rehab, nwanyị akwụna ahụ, na ndị ezinaụlọ ya niile dịrị ndụ. Nʼihi na Rehab zoro ndị ikom abụọ Joshua zigara, mee ka ha dị ndụ, bụ ndị gara inyochapụta obodo Jeriko. Ya mere, o binyere ndị Izrel ruo taa.

Joshua 6:25 (UKJV) And Joshua saved Rahab the harlot alive, and her father's household, and all that she had; and she dwells in Israel even unto this day; because she hid the messengers, which Joshua sent to spy out Jericho.

23Ya mere, ụmụ okorobịa abụọ ahụ bụ ndị mere nledo ala ahụ, bara nʼụlọ ahụ, kpọpụta Rehab na nna ya na nne ya na ụmụnne ya na ndị ikwu ya niile. Ha kpọpụtara ndị ezinaụlọ ya niile debe ha nʼotu ebe nke dị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ụmụ Izrel.

24Ha kpọrọ obodo ahụ ọkụ, ya na ihe niile dị nʼime ya. Ma ha wepụtara naanị ọlaọcha na ọlaedo, na ihe niile e ji bronz na igwe kpụọ, tinye nʼụlọakụ Onyenwe anyị.

25Joshua mere ka Rehab, nwanyị akwụna ahụ, na ndị ezinaụlọ ya niile dịrị ndụ. Nʼihi na Rehab zoro ndị ikom abụọ Joshua zigara, mee ka ha dị ndụ, bụ ndị gara inyochapụta obodo Jeriko. Ya mere, o binyere ndị Izrel ruo taa.

26Mgbe ahụ, Joshua gbara obodo Jeriko iyi sị, “Ọbụbụ ọnụ ka a na-abụ nwoke ọbụla nʼihu Onyenwe anyị nke ga-ebili wuokwa obodo Jeriko ọzọ. “Ndụ ọkpara ya ka ọ ga-eji tọọ ntọala ya niile, ndụ nwa ya nke nta, ka ọ ga-eji guzobe ọnụ ụzọ ama ya niile ọtọ.”

27Ya mere, Onyenwe anyị nọnyeere Joshua. Akụkọ a kọrọ banyere ya gbasara nke ukwuu nʼala ahụ niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.