1Ma e mechiri ọnụ ụzọ e si abata Jeriko nke ọma, nʼihi ụmụ Izrel. Ọ dịghị onye ọbụla na-apụ nʼezi, ọ dịghịkwa onye na-abata nʼime ya.
2Ma Onyenwe anyị gwara Joshua sị, “Lee, enyefela m obodo a bụ Jeriko, ya na eze ya, na ndị dị ike ibu agha nọ nʼime ya, nʼaka gị.
3Gị na ndị agha gị zọọnụ ije gburugburu obodo a. Unu ga-ejegharị gburugburu mgbidi obodo a otu ugbo nʼụbọchị. Unu ga-esi otu a jegharịa ụbọchị isii.
4Ndị nchụaja asaa, ndị ga-eji opi mpi ebule asaa ga-ebu ụzọ gawa nʼihu. Ndị nchụaja ndị ọzọ ga-ebu igbe ọgbụgba ndụ. Nʼụbọchị nke asaa, unu ga-agba obodo ahụ gburugburu ugboro asaa. Mgbe unu na-eme nke a, ndị nchụaja asaa ahụ ga na-afụ opi mpi ebule ha.
5Emesịa, ndị nchụaja ga-afụsi opi ahụ ike otu ugbo ọzọ, ha ga-afụ ya ka ọ daa ụda nke ukwu. Mgbe mmadụ niile nụrụ ụda opi a, ha niile ga-eti mkpu nke ga-ada ezi ụda. Nke a ga-eme ka mgbidi obodo ahụ daa. Mgbe ahụ, onye agha ọbụla ga-esite nʼebe ọbụla ọ nọ banye nʼime obodo ahụ.”