Joshua 6

Ndị nchụaja asaa, ndị ga-eji opi mpi ebule asaa ga-ebu ụzọ gawa nʼihu. Ndị nchụaja ndị ọzọ ga-ebu igbe ọgbụgba ndụ. Nʼụbọchị nke asaa, unu ga-agba obodo ahụ gburugburu ugboro asaa. Mgbe unu na-eme nke a, ndị nchụaja asaa ahụ ga na-afụ opi mpi ebule ha.

Joshua 6:4 (UKJV) And seven priests shall bear before the ark seven trumpets of rams' horns: and the seventh day all of you shall compass the city seven times, and the priests shall blow with the trumpets.

2Ma Onyenwe anyị gwara Joshua sị, “Lee, enyefela m obodo a bụ Jeriko, ya na eze ya, na ndị dị ike ibu agha nọ nʼime ya, nʼaka gị.

3Gị na ndị agha gị zọọnụ ije gburugburu obodo a. Unu ga-ejegharị gburugburu mgbidi obodo a otu ugbo nʼụbọchị. Unu ga-esi otu a jegharịa ụbọchị isii.

4Ndị nchụaja asaa, ndị ga-eji opi mpi ebule asaa ga-ebu ụzọ gawa nʼihu. Ndị nchụaja ndị ọzọ ga-ebu igbe ọgbụgba ndụ. Nʼụbọchị nke asaa, unu ga-agba obodo ahụ gburugburu ugboro asaa. Mgbe unu na-eme nke a, ndị nchụaja asaa ahụ ga na-afụ opi mpi ebule ha.

5Emesịa, ndị nchụaja ga-afụsi opi ahụ ike otu ugbo ọzọ, ha ga-afụ ya ka ọ daa ụda nke ukwu. Mgbe mmadụ niile nụrụ ụda opi a, ha niile ga-eti mkpu nke ga-ada ezi ụda. Nke a ga-eme ka mgbidi obodo ahụ daa. Mgbe ahụ, onye agha ọbụla ga-esite nʼebe ọbụla ọ nọ banye nʼime obodo ahụ.”

6Ya mere, Joshua nwa Nun kpọrọ ndị nchụaja sị ha, “Burunu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ, ka ndị nchụaja asaa nʼime unu werekwa opi mpi ebule buru ụzọ na-aga nʼihu ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.