Joshua 6

Mgbe Joshua gwachara ndị Izrel okwu, ndị nchụaja asaa ahụ bu opi ike nʼaka ha, nʼihu Onyenwe anyị, gafere nʼihu na-afụ opi ike ha. Ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị sochiri ha azụ.

Joshua 6:8 (UKJV) And it came to pass, when Joshua had spoken unto the people, that the seven priests bearing the seven trumpets of rams' horns passed on before the LORD, and blew with the trumpets: and the ark of the covenant of the LORD followed them.

6Ya mere, Joshua nwa Nun kpọrọ ndị nchụaja sị ha, “Burunu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ, ka ndị nchụaja asaa nʼime unu werekwa opi mpi ebule buru ụzọ na-aga nʼihu ya.”

7Mgbe ahụ Joshua nyere ndị Izrel iwu sị ha, “Zọlịenụ ije! Gbaanụ obodo a gburugburu, ka ndị agha na-aga nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.”

8Mgbe Joshua gwachara ndị Izrel okwu, ndị nchụaja asaa ahụ bu opi ike nʼaka ha, nʼihu Onyenwe anyị, gafere nʼihu na-afụ opi ike ha. Ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị sochiri ha azụ.

9Ndị agha na-aga nʼihu ndị nchụaja bụ ndị na-afụ opi ike, ebe ndị agha ndị ọzọ na-esote igbe ọgbụgba ndụ nʼazụ. Nʼoge a niile ha na-azọ ije, ndị na-afụ opi ike gara nʼihu na-eme nke a.

10Ma Joshua nyere ndị Izrel iwu sị ha, “Unu emela mkpọtụ agha ọbụla, maọbụ kwee ka anụ olu unu, maọbụ kwuo okwu ọbụla, tutu ruo ụbọchị m ga-asị unu tie mkpu. Mgbe m nyere unu iwu a, tienụ ezi mkpu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.