1Ma ụmụ Izrel ekwesighị ntụkwasị obi nʼihe gbasara ihe ndị ahụ e debere iche nye Onyenwe anyị. Nʼihi na Ekan nwa Kami, nwa Zimri, nwa Zera, onye si nʼebo Juda gara were ụfọdụ nʼime ihe ndị ahụ. Nke a mere ka iwe wee Onyenwe anyị nke ukwuu megide ụmụ Izrel.
2Emesịa, Joshua si Jeriko zipụ ụfọdụ ndị mmadụ ka ha gaa Ai, obodo dị Bet-Aven nso, nʼọwụwa anyanwụ Betel. Ọ gwara ha sị ha, “Gaanụ nnyopụta akụkụ ala ahụ niile.” Ya mere, ndị ahụ gara nnyochapụta obodo Ai.
3Mgbe ha lọghachiri azụ, ha gwara Joshua sị ya, “Ai bụ obodo nta. Ọ gaghị ewe karịa puku mmadụ abụọ maọbụ atọ imeri obodo ahụ. Ọ bakwaghị uru ka anyị niile gaa tigbuo obodo a, nʼihi na ha dị mmadụ ole na ole.”