Joshua 7

Mgbe ha lọghachiri azụ, ha gwara Joshua sị ya, “Ai bụ obodo nta. Ọ gaghị ewe karịa puku mmadụ abụọ maọbụ atọ imeri obodo ahụ. Ọ bakwaghị uru ka anyị niile gaa tigbuo obodo a, nʼihi na ha dị mmadụ ole na ole.”

Joshua 7:3 (UKJV) And they returned to Joshua, and said unto him, Let not all the people go up; but let about two or three thousand men go up and strike Ai; and make not all the people to labour thither; for they are but few.

1Ma ụmụ Izrel ekwesighị ntụkwasị obi nʼihe gbasara ihe ndị ahụ e debere iche nye Onyenwe anyị. Nʼihi na Ekan nwa Kami, nwa Zimri, nwa Zera, onye si nʼebo Juda gara were ụfọdụ nʼime ihe ndị ahụ. Nke a mere ka iwe wee Onyenwe anyị nke ukwuu megide ụmụ Izrel.

2Emesịa, Joshua si Jeriko zipụ ụfọdụ ndị mmadụ ka ha gaa Ai, obodo dị Bet-Aven nso, nʼọwụwa anyanwụ Betel. Ọ gwara ha sị ha, “Gaanụ nnyopụta akụkụ ala ahụ niile.” Ya mere, ndị ahụ gara nnyochapụta obodo Ai.

3Mgbe ha lọghachiri azụ, ha gwara Joshua sị ya, “Ai bụ obodo nta. Ọ gaghị ewe karịa puku mmadụ abụọ maọbụ atọ imeri obodo ahụ. Ọ bakwaghị uru ka anyị niile gaa tigbuo obodo a, nʼihi na ha dị mmadụ ole na ole.”

4Nʼihi nke a, ihe dịka puku ndị agha atọ ka e zigara imeri obodo Ai. Ma ngwangwa, ndị agha obodo Ai meriri ndị agha ụmụ Izrel, chụọ ha ọsọ.

5Ihe dịka iri mmadụ atọ na isii nʼetiti ndị agha Izrel ka e gburu nʼagha ahụ. Ndị Ai chụrụ ha ọsọ site nʼụzọ ama obodo ruo nʼebe a na-awa nkume, gbuo ha na mgbada ugwu ahụ. Nʼihi nke a, ndị agha Izrel dara mba, obi lọkwara ha mmiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.