Joshua 7

Ma Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Bilie ọtọ! Gịnị bụ nke a, na ị dara kpuo ihu nʼala?

Joshua 7:10 (UKJV) And the LORD said unto Joshua, Get you up; wherefore lie you thus upon your face?

8Biko, Onyenwe m, Gịnị ka m ga-ekwu ugbu a ụmụ Izrel sitere nʼihu ndị iro ha gbaa ọsọ?

9Nʼihi na mgbe ndị Kenan na ndị bi nʼakụkụ ala ahụ ga-anụ maka mmeri e meriri anyị, ha ga-agba anyị gburugburu lụso anyị agha, bipụ aha anyị nʼụwa. Ọ bụkwa gịnị ka ị ga-eme banyere aha ukwu gị dị ebube?”

10Ma Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Bilie ọtọ! Gịnị bụ nke a, na ị dara kpuo ihu nʼala?

11Izrel emehiela. Ha emebiela ọgbụgba ndụ m nyere ha nʼiwu idebe, ha ewerela ụfọdụ nʼime ihe ndị ahụ e doro iche nye Onyenwe anyị. Ọ bụghị naanị na ha zuru ohi, ha nọkwa nʼelu ya ghaa ụgha banyere ya. Ha ewerekwala ihe ndị ahụ tinyekọta nʼihe nke aka ha.

12Ọ bụ nʼihi nke a mere na ụmụ Izrel enwekwaghị ike iguzo nʼihu ndị iro ha. Ọ bụkwa nke a mere ha ji tụgharịa gbaa ọsọ, nʼihi na ha aghọọla ndị kwesiri ka e bibie. Ya mere, agaghị m anọnyere unu ọzọ, tutu ruo mgbe unu wezugara ma mebie site nʼetiti onwe unu, ihe ọbụla e debere iche maka mbibi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.