Joshua 7

Biko, Onyenwe m, Gịnị ka m ga-ekwu ugbu a ụmụ Izrel sitere nʼihu ndị iro ha gbaa ọsọ?

Joshua 7:8 (UKJV) O LORD, what shall I say, when Israel turns their backs before their enemies!

6Mgbe ahụ, Joshua na ndị okenye Izrel sitere nʼobi mwute dọwaa uwe ha, daa nʼala kpuo ihu nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Ha wekwara ntụ wụkwasị onwe ha nʼisi igosi obi mwute ha.

7Mgbe ahụ kwa, Joshua sịrị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị! Nʼihi gịnị ka i ji mee ka ndị a gabiga osimiri Jọdan, inyefe anyị nʼaka ndị Amọrait, ime ka ha tigbuo anyị? Ọ gaara adị anyị mma nke ọma ma ọ bụrụ na anyị nọdụrụ nʼofe ọzọ nke Jọdan.

8Biko, Onyenwe m, Gịnị ka m ga-ekwu ugbu a ụmụ Izrel sitere nʼihu ndị iro ha gbaa ọsọ?

9Nʼihi na mgbe ndị Kenan na ndị bi nʼakụkụ ala ahụ ga-anụ maka mmeri e meriri anyị, ha ga-agba anyị gburugburu lụso anyị agha, bipụ aha anyị nʼụwa. Ọ bụkwa gịnị ka ị ga-eme banyere aha ukwu gị dị ebube?”

10Ma Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Bilie ọtọ! Gịnị bụ nke a, na ị dara kpuo ihu nʼala?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.