Joshua 7

Mgbe ahụ, Joshua na ndị Izrel niile, duuru Ekan, nwa Zera, chịkọrọkwa ọlaọcha ahụ, na uwe mwụda ahụ, na mkpirisi ọlaedo ahụ, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom, na ehi na ịnyịnya ibu ya, na igwe ewu na atụrụ ya, na ụlọ ikwu ya, na ihe niile o nwere, gaa na Ndagwurugwu Akọ.

Joshua 7:24 (UKJV) And Joshua, and all Israel with him, took Achan the son of Zerah, and the silver, and the garment, and the wedge of gold, and his sons, and his daughters, and his oxen, and his asses, and his sheep, and his tent, and all that he had: and they brought them unto the valley of Achor.

22Ya mere, Joshua zigara ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa chọọ ihe ahụ Ekan zoro. Ndị a gara nʼụlọ ikwu ahụ, chọpụta ihe ahụ ezuru nʼohi. Dịka Ekan kwuru, ihe ikpeazụ ha hụrụ bụ ọlaọcha ahụ.

23Ha chịkọtara ha niile chịtara ha Joshua. Mgbe ha bịaruru ebe Joshua na ndị Izrel niile nọ, ha chịsara ya nʼala nʼihu Onyenwe anyị.

24Mgbe ahụ, Joshua na ndị Izrel niile, duuru Ekan, nwa Zera, chịkọrọkwa ọlaọcha ahụ, na uwe mwụda ahụ, na mkpirisi ọlaedo ahụ, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom, na ehi na ịnyịnya ibu ya, na igwe ewu na atụrụ ya, na ụlọ ikwu ya, na ihe niile o nwere, gaa na Ndagwurugwu Akọ.

25Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Gịnị mere i ji wetara anyị nsogbu ndị a? Onyenwe anyị ga-eme ka nsogbu dakwasịkwa gị onwe gị taa.” Ndị Izrel niile weere nkume tugbuo ha nʼebe ahụ. Emesịa, a kpọrọ ha ọkụ.

26Ha tụkọtara ọtụtụ nkume tụkwasị ya nʼelu Ekan. Nkume ndị a dị nʼebe ahụ ruo taa. Ọ bụkwa nʼụzọ dị otu a ka iwe ọkụ Onyenwe anyị ji dajụọ. Ya mere, e ji akpọ ebe ahụ Ndagwurugwu Akọ ruo taa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.