24Mgbe ahụ, Joshua na ndị Izrel niile, duuru Ekan, nwa Zera, chịkọrọkwa ọlaọcha ahụ, na uwe mwụda ahụ, na mkpirisi ọlaedo ahụ, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom, na ehi na ịnyịnya ibu ya, na igwe ewu na atụrụ ya, na ụlọ ikwu ya, na ihe niile o nwere, gaa na Ndagwurugwu Akọ.
25Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Gịnị mere i ji wetara anyị nsogbu ndị a? Onyenwe anyị ga-eme ka nsogbu dakwasịkwa gị onwe gị taa.” Ndị Izrel niile weere nkume tugbuo ha nʼebe ahụ. Emesịa, a kpọrọ ha ọkụ.
26Ha tụkọtara ọtụtụ nkume tụkwasị ya nʼelu Ekan. Nkume ndị a dị nʼebe ahụ ruo taa. Ọ bụkwa nʼụzọ dị otu a ka iwe ọkụ Onyenwe anyị ji dajụọ. Ya mere, e ji akpọ ebe ahụ Ndagwurugwu Akọ ruo taa.