Joshua 8

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Atụla egwu, adakwala mba. Chịrị ndị agha gị niile gaa Ai, nʼihi na ugbu a, unu onwe unu ga-emeri ha. Aga m eme ka i merie eze ndị Ai, na ndị ya na obodo ya, na ala ya.

Joshua 8:1 (UKJV) And the LORD said unto Joshua, Fear not, neither be you dismayed: take all the people of war with you, and arise, go up to Ai: see, I have given into your hand the king of Ai, and his people, and his city, and his land:

1Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Atụla egwu, adakwala mba. Chịrị ndị agha gị niile gaa Ai, nʼihi na ugbu a, unu onwe unu ga-emeri ha. Aga m eme ka i merie eze ndị Ai, na ndị ya na obodo ya, na ala ya.

2Ị ga-emekwa obodo Ai na eze ya ihe i mere Jeriko na eze ya. Ma ihe dị iche na nke a bụ na unu ga-edebere onwe unu ihe niile unu kwatara nʼagha, ya bụ anụ ụlọ niile na ngwongwo obodo ahụ niile. Jikerenụ ibuso ha agha. Ọ bụkwa nʼazụ obodo ha ka unu ga-esi lụso ha agha.”

3Mgbe ahụ, Joshua na ndị agha ya niile, biliri gaa ibuso Ai agha. Joshua họpụtara iri puku ndị agha atọ zipụ ha nʼabalị

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.