Joshua 8

Ọ dịkwaghị otu onye nwoke nke fọdụrụ na Ai maọbụ na Betel. Ha hapụkwara obodo ahụ ka o ghere oghe, gaa ịchụ ndị Izrel ọsọ.

Joshua 8:17 (UKJV) And there was not a man left in Ai or Bethel, that went not out after Israel: and they left the city open, and pursued after Israel.

15Joshua na ndị Izrel niile mere ka ha chụghachi ha azụ site nʼihu ha, ha gbara ọsọ na-aga akụkụ ọzara ahụ niile dịka ndị e meriri emeri.

16Nʼihi nke a, a kpọkuru ndị ikom niile nọ nʼime obodo Ai sị ha pụta bịa chụọ ụmụ Izrel ọsọ, ha chụrụ Joshua na-aga, e si otu a rapụta ha nʼebe dị anya site nʼobodo ahụ.

17Ọ dịkwaghị otu onye nwoke nke fọdụrụ na Ai maọbụ na Betel. Ha hapụkwara obodo ahụ ka o ghere oghe, gaa ịchụ ndị Izrel ọsọ.

18Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọrọ Joshua sị ya, “Setịpụ ùbe dị gị nʼaka nʼụzọ Ai, nʼihi na aga m enye gị obodo a.” Joshua mere dịka Onyenwe anyị gwara ya.

19Mgbe ndị agha ahụ zoro onwe ha nʼime ọhịa lere anya hụ na Joshua setịrị aka ya, ngwangwa, ha wụpụtara site nʼebe ha zoro onwe ha, gbara ọsọ gbaba nʼobodo Ai, merie ya, mụnye ya ọkụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.