4o nyere ha iwu a, “Lee! Unu ga-aga zoo onwe unu nʼọhịa dị nʼazụ obodo Ai. Unu ezola onwe unu nʼebe dị anya site nʼobodo ahụ, kama nọọnụ nso, nọọkwanụ na njikere.
5Mụ na ndị niile so m ga-abịaru obodo ahụ nso. Mgbe ha ga-apụta ịlụso anyị ọgụ dịka ha mere na mbụ, anyị ga-agbakwa ọsọ nʼihu ha,
6Ha ga-achụ anyị ọsọ, tutu ruo mgbe anyị mere ka ha niile hapụ nʼobodo ha pụta. Nʼihi nʼuche ha, ha ga-asị, ‘Ha na-agbara anyị ọsọ dịka ha mere na mbụ, bịanụ ka anyị chụọ ha ọsọ gbuo ha.’ Ya mere, dịka anyị na-agbapụ site nʼebe ha nọ,
7unu ga-esite nʼebe unu zoro onwe unu bilie, nweta obodo ahụ, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-enyefe ya nʼaka unu.
8Mgbe unu weere obodo ahụ, unu ga-esunye obodo ahụ ọkụ. Meenụ ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu. Hụnụ na unu mezuru ihe ndị a m nyere unu nʼiwu.”