Joshua 8

Mgbe Joshua nyesịrị ha iwu ndị a, o zipụrụ ha. Ha hapụkwara nʼabalị ahụ gaa zoo onwe ha nʼọhịa dị nʼetiti Betel na ọdịda anyanwụ Ai. Ma Joshua na ndị agha ndị ọzọ fọdụrụ nọdụrụ nʼabalị ahụ nʼetiti ndị Izrel.

Joshua 8:9 (UKJV) Joshua therefore sent them forth: and they went to lie in ambush, and abode between Bethel and Ai, on the west side of Ai: but Joshua lodged that night among the people.

7unu ga-esite nʼebe unu zoro onwe unu bilie, nweta obodo ahụ, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-enyefe ya nʼaka unu.

8Mgbe unu weere obodo ahụ, unu ga-esunye obodo ahụ ọkụ. Meenụ ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu. Hụnụ na unu mezuru ihe ndị a m nyere unu nʼiwu.”

9Mgbe Joshua nyesịrị ha iwu ndị a, o zipụrụ ha. Ha hapụkwara nʼabalị ahụ gaa zoo onwe ha nʼọhịa dị nʼetiti Betel na ọdịda anyanwụ Ai. Ma Joshua na ndị agha ndị ọzọ fọdụrụ nọdụrụ nʼabalị ahụ nʼetiti ndị Izrel.

10Nʼisi ụtụtụ echi ya, Joshua chịkọtara ndị agha ya, ya na ndị ndu Izrel gara nʼihu ha, ruo Ai.

11Ndị agha niile ha na ya so, chere ihu ha gaa nso obodo ruo nʼihu ya. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ugwu obodo Ai, ndagwurugwu bụ ihe kewara ha na obodo ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.