Joshua 8

Ndị agha niile ha na ya so, chere ihu ha gaa nso obodo ruo nʼihu ya. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ugwu obodo Ai, ndagwurugwu bụ ihe kewara ha na obodo ahụ.

Joshua 8:11 (UKJV) And all the people, even the people of war that were with him, went up, and drew nigh, and came before the city, and pitched on the north side of Ai: now there was a valley between them and Ai.

9Mgbe Joshua nyesịrị ha iwu ndị a, o zipụrụ ha. Ha hapụkwara nʼabalị ahụ gaa zoo onwe ha nʼọhịa dị nʼetiti Betel na ọdịda anyanwụ Ai. Ma Joshua na ndị agha ndị ọzọ fọdụrụ nọdụrụ nʼabalị ahụ nʼetiti ndị Izrel.

10Nʼisi ụtụtụ echi ya, Joshua chịkọtara ndị agha ya, ya na ndị ndu Izrel gara nʼihu ha, ruo Ai.

11Ndị agha niile ha na ya so, chere ihu ha gaa nso obodo ruo nʼihu ya. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ugwu obodo Ai, ndagwurugwu bụ ihe kewara ha na obodo ahụ.

12Joshua chịịrị ihe ruru puku ndị agha ise, zoo ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ obodo ahụ, nʼetiti Betel na Ai.

13Ya mere, ndị agha were ọnọdụ ha nʼusoro, ndị ga-ebu agha nọ nʼakụkụ ugwu, ndị niile zoro onwe ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke obodo ahụ. Ma nʼabalị ahụ, Joshua gara nọdụ na ndagwurugwu ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.