Joshua 8

Ya mere, ndị agha were ọnọdụ ha nʼusoro, ndị ga-ebu agha nọ nʼakụkụ ugwu, ndị niile zoro onwe ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke obodo ahụ. Ma nʼabalị ahụ, Joshua gara nọdụ na ndagwurugwu ahụ.

Joshua 8:13 (UKJV) And when they had set the people, even all the host that was on the north of the city, and their hidden attackers in wait on the west of the city, Joshua went that night into the midst of the valley.

11Ndị agha niile ha na ya so, chere ihu ha gaa nso obodo ruo nʼihu ya. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ugwu obodo Ai, ndagwurugwu bụ ihe kewara ha na obodo ahụ.

12Joshua chịịrị ihe ruru puku ndị agha ise, zoo ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ obodo ahụ, nʼetiti Betel na Ai.

13Ya mere, ndị agha were ọnọdụ ha nʼusoro, ndị ga-ebu agha nọ nʼakụkụ ugwu, ndị niile zoro onwe ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke obodo ahụ. Ma nʼabalị ahụ, Joshua gara nọdụ na ndagwurugwu ahụ.

14Mgbe eze Ai hụrụ nke a, ya na ndị ikom obodo ahụ niile mere ngwangwa pụọ nʼisi ụtụtụ izute ndị Izrel nʼotu ebe, nke chere ihu nʼAraba. Ma ọ mataghị na o nwere ndị agha zubere imegide ya ndị zoro onwe ha nʼọhịa dị nʼazụ obodo.

15Joshua na ndị Izrel niile mere ka ha chụghachi ha azụ site nʼihu ha, ha gbara ọsọ na-aga akụkụ ọzara ahụ niile dịka ndị e meriri emeri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.