Joshua 9

Mgbe ahụ, Joshua na ndị ahụ gbara ndụ udo ikwe ka ha dị ndụ. Ndịisi nzukọ Izrel mesiri ọgbụgba ndụ ahụ ike site nʼịṅụ iyi.

Joshua 9:15 (UKJV) And Joshua made peace with them, and made a league with them, to let them live: and the princes of the congregation swore unto them.

13A gbajuru karama akpụkpọ anyị ndị a mmanya ọhụrụ mgbe anyị hapụrụ, ma ugbu a, karama ndị a adọwaala. Uwe anyị, na akpụkpọụkwụ anyị, emeela ochie nʼihi ịga ije dị anya.”

14Ndị ikom Izrel ritụrụ ụfọdụ nʼime ihe oriri ha ji bịa, ma ha ajụtaghị ihe bụ uche Onyenwe anyị.

15Mgbe ahụ, Joshua na ndị ahụ gbara ndụ udo ikwe ka ha dị ndụ. Ndịisi nzukọ Izrel mesiri ọgbụgba ndụ ahụ ike site nʼịṅụ iyi.

16Mgbe ụbọchị atọ gasịrị site na mgbe ụmụ Izrel na ndị Gibiọn gbara ndụ, ndị Izrel nụrụ na ndị Gibiọn bụ ndị agbataobi ha, ndị bi ha nso.

17Ya mere, ndị Izrel buliri ije gaa ịchọpụta ebe ndị a si bịa, si otu a bịaruo obodo ha niile nʼụbọchị nke atọ. Aha obodo ha bụ Gibiọn, Kefira, Beerọt na Kiriat Jearim.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.