14Ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka Enọk, onye bụ agbụrụ nke asaa site nʼAdam buru nʼamụma banyere ha sị, “Lee! Onyenwe anyị na-abịa, ya na puku kwụrụ puku ndị nsọ ya.
15Ọ na-abịa ikpe mmadụ niile ikpe, na ịtụ ha niile mmehie ajọ omume niile ha nʼanya, bụ nke ha mere nʼụzọ na-ezighị ezi. Tinyere okwu ọjọọ niile nke ndị mmehie ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke kwuru megide ya.”
16Ndị a bụ ndị na-atamu ntamu oge niile, ndị o nweghị ihe ọbụla na-adị ha mma. Ndị na-agbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ. Ha na-anya isi banyere onwe ha, na-aja ndị ọzọ mma; ka ha nwee ike nweta ihe ha na-achọ nʼaka ha.
17Ma unu, ndị m hụrụ nʼanya, chetanụ ihe ndị ozi Onyenwe anyị Jisọs Kraịst kwuru na ha ga-emezu.
18Nʼihi na ha sịrị unu, “Nʼọgwụgwụ oge ahụ, ndị na-eji ihe niile na-emere ihe ọchị ga-adị. Ndị na-agbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ.