Jud 1

Ka ebere na udo na ịhụnanya bara unu ụba.

Jude 1:2 (UKJV) Mercy unto you, and peace, and love, be multiplied.

1Jud, odibo Jisọs Kraịst, na nwanne Jemis, Na-edegara ndị niile a kpọrọ, ndị ahụrụ nʼanya nʼime Chineke, bụ Nna, na ndị nọkwa nʼokpuru nchebe Jisọs Kraịst akwụkwọ ozi a:

2Ka ebere na udo na ịhụnanya bara unu ụba.

3Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ na-anụ m ọkụ nʼobi idere unu akwụkwọ banyere nzọpụta ahụ anyị nwekọrọ nʼotu, ma ahụrụ m mkpa ọ dị idere unu akwụkwọ a, ịrịọ unu ka unu guzosie ike buo agha ichebe okwukwe ahụ, nke e nyefere ndị nsọ nʼaka idebe.

4Nʼihi na ụfọdụ mmadụ, bụ ndị e dere ihe banyere ọmụma ikpe dịrị ha, siterị nʼoge gara aga, ezobatala nʼetiti unu. Ha bụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị na-agbanwe amara Chineke anyị, mee ya ka ọ bụrụ ohere ha nwere ibi ndụ ịkwa iko, na nke ịgọnarị Jisọs Kraịst, onye naanị ya bụ Onye kachasị ihe niile elu na Onyenwe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.